1 Kings 8

Mbubata igbe ọgbụgba ndụ nʼime Ụlọnsọ Ukwu

1Mgbe ahụ, eze Solomọn kpọkọtara ndị okenye Izrel, na ndịisi ebo niile, na ndịisi ezinaụlọ Izrel niile, ka ha bịakwute eze na Jerusalem, maka i site na Zayọn bụ obodo Devid bugota igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. 2Ndị Izrel niile gbakọtara bịakwute eze Solomọn nʼoge a na-eme mmemme nʼọnwa Etanim
Ọnwa Etanim, bụ ihe dị ka ọnwa itoolu, ma ọ bụkwanụ ọnwa iri ndị Juu.
nke bụ ọnwa asaa nʼafọ.

3Mgbe ndị okenye Izrel niile bịarutere, ndị nchụaja buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ. 4Ha bugotara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ya na ụlọ nzute, na ngwongwo niile dị nsọ dị nʼime ya. Ndị nchụaja na ndị Livayị buliri ha elu. 5Eze Solomọn na ọgbakọ Izrel niile, bụ ndị zukọtara nʼebe ọ nọ, nọ nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na-achụ aja ọtụtụ atụrụ na ọtụtụ ehi nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ gbakọta ọnụọgụgụ ha nʼihi ịba ụba.

6Ndị nchụaja bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼime Ebe Kachasị Nsọ, dọba ya nʼokpuru nku cherubim ahụ. 7Cherubim ndị ahụ gbasara nku ha nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, zochie igbe ọgbụgba ndụ ahụ na okporo osisi ndị e ji ebu ya. 8Okporo osisi ndị a dị oke ogologo, na e nwere ike ị site nʼEbe Nsọ, dị nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ hụ isi ha anya, ma onye na-anọghị nʼEbe Nsọ ahụ adịghị ahụ ha. Ha ka dịkwa nʼebe ahụ ruo taa. 9O nweghị ihe dị nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ, karịakwa mbadamba nkume abụọ ahụ Mosis tinyere nʼime ya nʼugwu Horeb, nʼebe Onyenwe anyị na ụmụ Izrel gbara ndụ, mgbe ha si nʼala Ijipt pụta.

10Mgbe ndị nchụaja si nʼEbe Nsọ ahụ pụta, igwe ojii jupụtara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. 11Ndị nchụaja enwekwaghị ike jee ozi ha, nʼihi igwe ojii ahụ, nʼihi na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼime ụlọnsọ ya.

12Mgbe ahụ, Solomọn sịrị, “Onyenwe anyị ekwuola na ọ ga-ebi nʼoke igwe ojii. 13Ma nʼezie, ewuola m ụlọnsọ pụrụ iche, maa mma nye gị, ebe ị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.”

14Dịka ọgbakọ Izrel niile na-eguzo nʼebe ahụ, eze chigharịrị onwe ya chee ha ihu, gọzie ha. 15Mgbe ahụ, ọ sịrị,

“Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel, onye ji aka ya mezuo nkwa nke o sitere nʼọnụ ya kwee nna m Devid. Nʼihi na o kwuru sị,
16‘Site nʼụbọchị ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta ndị m, ahọpụtaghị m obodo ọbụla nʼebo ọbụla nke Izrel, ka e wuru m ụlọnsọ ka Aha m dịrị nʼebe ahụ. Ma a họrọla m Devid ị bụ onye ga-achị ndị m Izrel.’

17“Nna m, Devid bu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel. 18Ma Onyenwe anyị sịrị nna m, Devid, ‘I mere nke ọma ibu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha m. 19Ma otu ọ dị, ọ bụghị gị ga-ewu ụlọnsọ ukwu ahụ, kama ọ bụ nwa gị nwoke, anụ ahụ gị na ọbara gị; ọ bụ ya ga-ewu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.’

20“Ugbu a, Onyenwe anyị emezuola nkwa ahụ o kwere. A nọchiela m nna m Devid, ugbu a, ana m anọdụ nʼocheeze nke Izrel dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa. Ewuokwala m ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel. 21Edoziekwala m ọnọdụ ebe igbe ọgbụgba ndụ ahụ ga-adị, nʼime ya ka ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị dị, bụ nke ya na nna nna anyị ha gbara, mgbe o mere ka ha si nʼala Ijipt pụta.”

Ekpere Solomọn

22Mgbe ahụ, Solomọn guzoro nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, na nʼihu ọgbakọ ụmụ Izrel niile, gbasapụ aka ya abụọ chilie ha elu, 23kwuo sị,

Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, ọ dịghị Chineke dịka gị nʼeluigwe nke dị nʼelu, maọbụ nʼụwa, nʼokpuru eluigwe. Gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya gị na ndị ohu gị, bụ ndị ji obi ha niile na-eso ụzọ gị.
24I mezuokwala nkwa niile i kwere nna m Devid, bụ ohu gị. I ji ọnụ gị kwee nkwa a ma taa, i jirila aka gị mezuo ya.

25“Ugbu a, O! Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, mezukwaa nkwa niile i kwere Devid nna m, mgbe ị sịrị, ‘Ọ bụrụ na ụmụ ụmụ gị elezie anya bie ndụ nʼụzọ kwesiri ntụkwasị obi nʼihu m, nʼihe niile ha na-eme, dịka gị onwe gị mere, agaghị achọ onye ga-anọ nʼihu m nʼocheeze Izrel nʼime ha.’ 26Ma ugbu a, Chineke nke Izrel, ka okwu gị, bụ nkwa nke i kwere ohu gị, bụ nna m Devid, bịa na mmezu.

27“Ma ọ bụ ezie na gị Chineke ga-ebi nʼelu ụwa? Lee, eluigwe ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe, ezughị ịba gị. Olee otu ụlọ a nke m wuru ga-esi bata gị? 28Ma Onyenwe anyị Chineke m, ṅaa ntị nʼekpere ohu gị, na arịrịọ ọ na-arịọ maka ebere. Nụrụ akwa na ekpere nke ohu gị na-ekpe nʼihu gị taa. 29Biko, mee ka anya gị abụọ ghere oghe nʼebe ụlọnsọ ukwu a dị, abalị na ehihie, bụ ebe a i kwuru banyere ya, sị, ‘Aha m ga-adị nʼebe ahụ,’ ka i si otu a nụrụ ekpere nke ohu gị ga-ekpe banyere ebe a. 30Nụrụkwa arịrịọ ohu gị na nke ndị gị Izrel niile, mgbe ọbụla ha chere ihu ha nʼebe a nʼekpere. Biko, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ, mgbe ị nụrụ biko, gbagharakwa.

31“Mgbe onye ọbụla mehiere mmadụ ibe ya, a kpọọ ya oku ka ọ bịa ṅụọ iyi, onye dị otu a bịa, guzo nʼebe a, nʼihu ebe ịchụ aja gị a, ṅụọ iyi ahụ. 32Mgbe ahụ, nụrụ olu ya nʼeluigwe ma mee ihe ziri ezi. Kpeekwa ikpe nʼetiti ndị ohu gị, maa onye mejọrọ ikpe site nʼịtụkwasị nʼisi ha ihe o metara, meekwa ka onye aka ya dị ọcha nwere onwe ya, site nʼimeso ha dịka ezi omume ha si dị.

33“Mgbe ndị iro meriri ndị gị Izrel, nʼihi na ha mehiere megide gị, ọ bụrụ na ha alọghachikwute gị, too aha gị, na-ekpe ekpere, na-arịọ gị arịrịọ nʼụlọnsọ ukwu a, 34biko, site nʼeluigwe nụrụ ekpere ha, gbaghara mmehie ndị gị Izrel. Meekwa ka ha lọghachita nʼala ahụ nke i nyere nna nna ha.

35“Mgbe e gbochiri eluigwe, mee na mmiri adịghị ezokwa, nʼihi na ndị gị emehiela megide gị, ọ bụrụ na ha echee ihu nʼebe a kpee ekpere, too aha gị, si na mmehie ha chegharịa, nʼihi na ịtaala ha ahụhụ. 36Biko, site nʼeluigwe nụrụ ma gbagharakwa mmehie ndị ohu gị, bụ ndị gị Izrel. Kuziere ha ezi ụzọ ha ga-esi bie ndụ ma zidata mmiri ozuzo nʼala ahụ nke i nyere ndị gị ka ọ bụrụ ihe nketa ha.

37“Mgbe ụnwụ maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe ga-adakwasị ala a, maọbụ ọrịa na-eripịa ihe ubi maọbụ ọmụma ebu, maọbụ igurube maọbụ ụkpana, maọbụ mgbe onye iro nọchibidoro ha nʼobodo ha niile, ihe mbibi niile maọbụ ọrịa ọbụla, 38ekpere ọbụla maọbụ arịrịọ nke onye ọbụla nʼetiti ndị gị Izrel kpere ma rịọọ, nʼihi ịghọta ihe otiti niile nke obi ha, ha gbasapụ aka ha, ma chee ihu ha nʼebe ụlọnsọ ukwu dị, 39mgbe ahụ, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Gbaghara ma meekwa; mesoo onye ọbụla dịka ihe niile ha na-eme si dị, ebe ọ bụ na ị maara obi ha niile, nʼihi na naanị gị maara obi mmadụ ọbụla, 40ka ha tụọ egwu gị oge niile nke ha na-ebi nʼala ahụ nke i nyere nna nna anyị ha.

41“Ma banyere onye mba ọzọ, onye na-esonyeghị na ndị gị Izrel, kama o si nʼala ebe dị anya bịa nʼihi Aha gị, 42nʼihi na ha ga-anụ ihe banyere aha ukwu gị, nʼaka gị dị ike na ogwe aka gị e setipụrụ esetipụ. Mgbe ha bịara kpee ekpere nʼụlọnsọ a, 43mgbe ahụ, site nʼeluigwe ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Mekwaa ihe niile nke onye mba ọzọ ahụ na-arịọ nʼekpere, ka ndị niile nke ụwa mara aha gị, tụọkwa egwu gị, dịka ndị nke gị bụ Izrel na-eme, ka ha matakwa na-akpọkwasịrị Aha gị nʼụlọ a nke m wuru.

44“Mgbe ndị gị ga-aga ibu agha megide ndị iro ha, nʼebe ọbụla ị na-eziga ha, mgbe ha chere ihu ha nʼụzọ obodo a nke ị họpụtara na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị, kpee ekpere nye Onyenwe anyị, 45mgbe ahụ, site nʼeluigwe nụrụ ekpere na arịrịọ amara ha, mezukwa ihe ha na-arịọ (dịnyekwara ha).

46“Mgbe ha mehiere megide gị, nʼihi na ọ dịghị mmadụ ọbụla na-adịghị emehie, ị wee iwe megide ha, rara ha nyefee nʼaka ndị iro ha, ndị dọkpụrụ ha nʼagha gaa nʼobodo ọzọ, maọbụ obodo dị anya maọbụ nke dị nso; 47ọ bụrụ na ha anọrọ nʼala ahụ a dọkpụrụ ha gaa, chegharịa nʼobi ha, nọrọ nʼala ebe ahụ eji ha rịọọ gị, sị, ‘Anyị emehiela, anyị emeela ihe nʼadịghị mma, anyị emekwala ajọ omume’; 48ọ bụrụ na ha ejiri obi ha na mmụọ ha niile chegharịa, nʼala ebe ndị iro ha, bụ ndị dọọrọ ha nʼagha, ma kpee ekpere nye gị chee ihu ha nʼụzọ ala a nke i nyere nna nna ha, nʼobodo a nke ị họpụtara, ya na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị; 49mgbe ahụ, site nʼeluigwe, ebe obibi gị, nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha, nyekwara ha aka. 50Gbaghara ndị gị, bụ ndị mehiere megide gị, gbaghara njehie niile ha mere megide gị, ma meekwa ka ndị dọtara ha nʼagha gosi ha obi ebere. 51Nʼihi na ha bụ ndị gị na oke gị, ndị i mere ka ha si nʼala Ijipt pụta, ala oke ịta ahụhụ nke nhụju anya.

52“Ka anya gị ghere oghe nʼarịrịọ mụ bụ ohu gị, nakwa nʼarịrịọ ndị gị Izrel, biko, na-egekwa ha ntị mgbe ọbụla ha bekuru gị akwa. 53Nʼihi na gị onwe gị kewapụtara ha site na mba niile nke ụwa ka ha bụụrụ gị ihe nketa, dịka ị kwupụtara site nʼọnụ ohu gị bụ Mosis, mgbe gị bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị mere ka nna nna anyị ha si nʼala Ijipt pụta.”

54Mgbe Solomọn kpechara ekpere ndị a ya na arịrịọ ọ rịọrọ Onyenwe anyị o si nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, bụ ebe o gburu ikpere nʼala, bilie, gbasapụ aka ya abụọ chilie ha elu. 55O guzoro gọzie ọgbakọ Izrel niile, gwa ha okwu nʼoke olu sị ha,

56“Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, onye nyere ndị ya, Izrel izuike dịka o kwere na nkwa. Ọ dịkwaghị okwu ọbụla nke na-emezughị nʼime ezi nkwa ahụ niile o kwere site nʼọnụ Mosis ohu ya. 57Ka Onyenwe anyị Chineke anyị dịnyere anyị, dịka o si dịnyere nna nna anyị ha. Ka ọ gharakwa ịhapụ anyị, maọbụ gbakụta anyị azụ. 58Ya nyekwa anyị mmụọ ime ihe niile ọ chọrọ, dịka uche nsọ ya si dị, na mmụọ ijezi ije nʼụzọ ya niile, na idebe ụkpụrụ na iwu niile nke o nyere nna nna anyị ha. 59Ka okwu m ndị a niile, nke m ji rịọ amara nʼihu Onyenwe anyị dịkwa Onyenwe anyị Chineke anyị nso ehihie na abalị. Ka o nyekwara ohu ya na ndị Izrel niile aka, dịka mkpa ụbọchị ọbụla si dị. 60Ka ndị niile bi nʼụwa mara na Onyenwe anyị bụ Chineke, marakwa na o nweghị chi ọzọ dị karịa ya. 61Ya mere, werenụ obi unu nyechasịa Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, kpamkpam, na-ebinụ ndụ nʼụkpụrụ ya, rubenụ isi nʼiwu ya, dịka ọ dị taa.”

Ido Ụlọnsọ Ukwu ahụ Nsọ

62Mgbe ahụ, eze ya na ndị Izrel niile chụrụ aja dị iche iche nʼihu Onyenwe anyị. 63Solomọn chụrụ aja udo, bụ nke ọ chụrụ nye Onyenwe anyị. Ehi dị puku iri abụọ na abụọ, na ewu na atụrụ dị narị puku na iri puku abụọ. Ya mere, eze na ndị Izrel niile si otu a doo ụlọnsọ Onyenwe anyị nsọ.

64Nʼotu ụbọchị ahụ kwa, eze doro etiti ogige dị nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ nsọ. Nʼebe ahụ ka ọ nọ chụọ aja nsure ọkụ, aja onyinye mkpụrụ ọka na aja abụba udo. O mere nke a nʼihi na ebe ịchụ aja bronz nke na-eguzo nʼihu Chineke dị oke nta ịbata aja nsure ọkụ niile, aja mkpụrụ ọka niile nakwa aja abụba udo niile ahụ.

65Ya mere, Solomọn ya na ndị Izrel niile mere mmemme a nʼoge ahụ, ọ bụ nzukọ dị ukwuu. Ndị mmadụ bịara sitere na Lebo Hamat ruo na mmiri iyi Ijipt. Ha mere mmemme a nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị, ụbọchị asaa tinyere ụbọchị asaa ọzọkwa, ya bụ agụkọta ha ụbọchị iri na anọ. 66Nʼụbọchị nke na-eso ya, o zilagara ndị ahụ niile. Ha gọziri eze, laakwa nʼụlọ ha, nʼịṅụrị ọṅụ na obi ụtọ nʼihi ihe ọma niile nke Onyenwe anyị meere ohu ya Devid, na ndị ya Izrel.

Copyright information for IboBIU